Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 23:8 - Bible Nso

8 Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 23:8
20 Iomraidhean Croise  

Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha, Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo.


Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu: Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu.


Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya, Iwezuga uzọ nile nke ikpé.


Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya: Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.


Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì: Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ.


N'ezie nmeb͕u nēme ka onye mara ihe ghọ onye-nzuzu; ọzọ, onyinye nēme ka obi amam-ihe la n'iyì.


Unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísi utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi nb͕ochi.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya:


ndi nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume n'ihi iri-ngo, ha nēwezuga kwa ezi omume nke onye ezi omume n'aru ya!


Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n'anya nke-uku.


N'ihi na amawom na ihe bara uba ka njehie-unu bu, na ihe di ike ka nmehie nile unu bu; unu ndi nākpab͕u onye ezi omume, ndi nānara ihe-nb͕aputa, ma ọ bu umu-ob͕eye di n'ọnu-uzọ-ama-unu ka unu nēwezuga n'ikpe-ha.


Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu Chineke kachasi chi nile, na Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, Chineke uku ahu, bú dike, di kwa egwu, Onye nāhughi madu iru-ọma n'ikpé, Onye nānaraghi ihe-iri-ngo.


Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.


Lem: b͕agidem àmà n'iru Jehova, na n'iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m'naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m'naraworo? ma-ọbu ònye ka m'meb͕uworo? ònye ka m'zọpiaworo? ma-ọbu n'àka onye ka m'naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n'aru ya? m'gēnyeghachi kwa unu ya.


Ma umu-ya ndikom ejeghi kwa ije n'uzọ-ya nile, ha we wezuga onwe-ha soro urù nēzighi ezi, ha we nara ihe-iri-ngo, wezuga ikpé.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan