Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 23:27 - Bible Nso

27 Oké ujọm ka M'gēziga n'iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M'gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 “Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 23:27
17 Iomraidhean Croise  

Ha we bulie ije: ujọ nke Chineke we dikwasi obodo nile nke di ha buruburu, ha achughi kwa umu-ndikom Jekob.


Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.


N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.


Ha we tib͕ue obodo nile di Gera buruburu; n'ihi na oké egwu nke Jehova dakwasiri ha: ha we luta ihe obodo nile n'agha; n'ihi na ọtutu ihe-nluta-n'agha di nime ha.


Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.


N'ihi na I gēme ka ha b͕akuta azu, I gēji udọ̀-uta-I dozi àkú imegide ha n'iru.


M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:


N'ihi na M'gānara mba di iche iche ala-ha n'iru gi, me ka ókè-ala-gi nile sa mbara: ọ dighi kwa onye ọ bula gēnwe anya-uku n'ebe ala-gi di, mb͕e i nārigo ka ewe hu gi n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ub͕ò atọ n'arọ.


Moab we tua ujọ ndi Israel nke-uku, n'ihi na ọtutu ka ha di; ike gwusia Moab n'iru umu Israel.


Jehova gānapu kwa mba ndia nile ala-ha n'iru unu, unu gēnweta kwa mba di iche iche di uku di kwa ike kari unu.


Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.


Ta ka M'gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n'iru ndi nile n'okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n'ihi unu.


ikwapu ndi-iro-gi nile n'iru gi, dika Jehova kwuworo.


Ma Jehova, bú Chineke-gi, gāra ha nye n'iru gi, me kwa ka ha b͕a aghara uku, rue mb͕e agēkpochapu ha.


Ọma-jijiji we di n'ọmuma-ulo-ikwū, na n'ọhia, na n'etiti ndi ahu nile; ndi ebe-nguzo-ndi-agha na ndi-nbibi, ha onwe-ha ma-kwa-ra jijiji: ala de-kwa-ra ùdé; o we ghọ ọma-jijiji nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan