Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 23:18 - Bible Nso

18 Achula ọbara nke àjàm n'elu achicha koro eko; abuba nke ememem agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m. “Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 23:18
10 Iomraidhean Croise  

Unu agaghi-eme ka ihe ọ bula fọdu site na ya rue ututu; ma ihe fọduru site na ya rue ututu, n'ọku ka unu gēsure ya.


Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n'ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n'ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n'Israel.


Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya.


Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.


Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di.


Eb͕upula ọbara nke àjàm n'elu ihe nēko achicha; àjà ememe ngabiga agaghi-adigide kwa abali nile rue ututu.


Ọ dighi onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke unu gēweta nso Jehova agēji ihe nēko achicha me: n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula nke nēko achicha, ma-ọbu manu-aṅu ọ bula, unu gēji sure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru àjà-ọku anāchuru Jehova.


Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.


Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu.


Agaghi-ahu kwa ihe nēko achicha n'aka-gi n'ókè-ala-gi nile ubọchi asa; ọ dighi kwa ihe ọ bula nime anu ahu, nke i nāchu n'àjà n'anyasi n'ubọchi mbu, gādigide abali nile rue ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan