Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 23:13 - Bible Nso

13 Ma n'ihe nile M'siworo unu lezienu anya: unu ehota-kwa-la aha chi ọ bula ọzọ, ka aghara kwa inu ya n'ọnu-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 23:13
21 Iomraidhean Croise  

Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova: M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara, M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum.


Asirim, Ka m'lezie uzọm nile anya, Ka m'we ghara iwere irem mehie: Ka m'debere ọnum ihe ikechi ọnu, Mb͕e onye nēmebi iwu nọ n'irum.


Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.


Gi na ha ab͕ala ndu, gi na chi-ha ab͕a-kwa-la ndu.


Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.


M'gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n'ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n'aha-ha ọzọ.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga.


na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.


n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo.


Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe;


unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.


Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n'ihi na unu ahughi udi ọ bula n'ubọchi Jehova si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb:


Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela.


Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;


Ma nka bu ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;


Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.


nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu;


Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè.


Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.


ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n'etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan