Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 22:7 - Bible Nso

7 Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n'ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Ọ bụrụ na mmadụ enye enyi ya maọbụ onye agbataobi ya ego, maọbụ ihe ọbụla ka o debere ya, ma onye ohi agaa zuru ya site nʼụlọ ya, a si na e jide onye ohi dị otu a, ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe o zuru okpukpu abụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 22:7
10 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.


Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi.


Dika ihere onye-ori mb͕e anāchọputa ya, otú a ka emeworo ka ihere me ulo Israel; ha onwe-ha, na ndi-eze-ha, na ndi-isi-ha, na ndi-nchu-aja-ha, na ndi-amuma-ha;


Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Mb͕e madu gēmehie, mekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ghọb͕u madu-ibe-ya n'ihe-ndebe, ma-ọbu n'ihe etiyere n'aka-ya, ma-ọbu n'ihe anapuru madu n'ike, ma-ọbu mb͕e ọ meb͕uworo madu-ibe-ya;


ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n'ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n'ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya.


Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.


ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan