Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 22:31 - Bible Nso

31 Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n'ọhia; nkita ka unu gātudara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 “Unu ga na-abụrụ m ndị dị nsọ. Nʼihi nke a, wezuganụ onwe unu nʼebe anụ a dọgburu adọgbu dị. Unu erikwala anụ dị otu a, kama tụpụrụnụ ya nkịta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 22:31
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ha esiwo n'umu-ha ndinyom lutara onwe-ha nwunye, luta-kwa-ra umu-ha ndikom; nkpuru nsọ ahu we gwakọta onwe-ha na ndi di iche iche nke ala ọzọ: ma aka ndi-isi na ndi nāchi ala bu uzọ na nmekpu a.


M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, emerughi nkpuru-obim: erighkwam ihe nwuru n'onwe-ya, ma-ọbu ihe anu dọb͕uru, site na mb͕e m'di na nwata we rue ub͕u a; ọ dighi kwa anu nke bu ihe-árú bàworo n'ọnum.


Ihe ọ bula nke nwuru n'onwe-ya, na ihe adọb͕uru adọb͕u, ma ọ bu anu-ufe ma-ọbu anumanu, ndi-nchu-àjà agaghi-eri ya.


Gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si ha, Nsọ ka unu gādi: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, Chineke-unu, di.


Unu gākpa kwa ókè n'etiti anumanu di ọcha na nke ruru árú, na n'etiti anu-ufe ruru árú na nke di ọcha: unu ewe-kwa-la anumanu me onwe-unu ihe-árú, ewe-kwa-la anu-ufe, ewe-kwa-la ihe ọ bula nākpu akpu n'ala, nke M'kpaworo ókè n'etiti unu na ya, ime ka ọ rua árú.


Ihe nwuru onwe-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, ọ gaghi-eri ya, iwere ya meru onwe-ya: Mu onwem bu Jehova.


Abuba nke anumanu nwuru onwe-ya, na abuba nke anumanu anu-ọhia dọb͕uru, agēdozi ya iji je ozi ọ bula: ma unu erila ya ma-ọli.


Ma Pita siri, M'gaghi-eri ma-ọli, Onye-nwe-ayi; n'ihi na ọ dighi mb͕e ọ bula m'riri ihe ọ bula nke ruru árú nke nādighi kwa ọcha.


kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara.


Unu erila ihe nwuru onwe-ya: ọ bu ọbìa nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula ka i gēnye ya, ka ọ we rie ya; ma-ọbu i gērenye ya onye ala ọzọ: n'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi. Esila nwa-ewu nime miri-ara nke nne-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan