Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 22:3 - Bible Nso

3 Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Kama ọ bụrụ na e tigburu onye ahụ mgbe chi bọcharala, ọmụma ikpe ga-adịrị onye ahụ tigburu ya. “Ọ bụrụ na e jide onye ohi, a ga-eme ka ọ kwụghachi ihe o zuru nʼohi. Ọ bụrụ na o nweghị ike kwụghachi, a ga-ere ya dịka ohu, jiri ego e retara kwụọ ụgwọ o ji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 22:3
9 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya.


Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu.


onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.


Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka ndi Filistia, na n'aka umu Amon.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n'aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n'iru ndi-iro-ha ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan