Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 22:26 - Bible Nso

26 Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n'ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 22:26
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu, Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.


Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.


Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.


Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:


Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo, Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.


I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.


Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha.


Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.


Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ, N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi?


o meghi onye ọ bula ihe-ike, ọ naraghi ihe-ibe, ọ punaraghi madu ihe n'ike, nri-ya ka o nyeworo onye-agu, onye-ọtọ ka o kpuchiworo uwe,


nke nādighi-eme onye ọ bula ihe-ike, nke nēnyeghachi onye-ugwọ ihe-ibe-ya, nke nādighi-apunara madu ihe n'ike, nke nēnye onye-agu nri-ya, nke nēkpuchi onye-ọtọ uwe;


asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n'ike, jegharia n'ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.


ọ bu kwa n'elu uwe anaraworo n'ihe-ibe ka ha nēseti onwe-ha n'akuku ebe-ichu-aja nile ọ bula, ọ bu kwa manya-vine nke ndi eriworo ha nra ka ha nāṅu n'ulo Chineke-ha.


Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe:


Madu agaghi-ewere nkume-igwe-nri ma-ọbu aka-nkume n'ihe-ibe: n'ihi na ndu madu ka onye ahu nēwere n'ihe-ibe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan