Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 22:21 - Bible Nso

21 Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 22:21
22 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.


Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ.


Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.


Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n'ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n'ihi na ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.


mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:


Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.


Emeb͕ula madu-ibe-gi, anapu-kwa-la ya ihe n'ike: ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu agaghi-adigide n'aka-gi ogologo abali nile rue ututu.


Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike.


Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi.


unu emeb͕u-kwa-la nwanyi di-ya nwuru, na nwa-nb͕ei, na ọbìa, na onye ewedara n'ala; unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide nwa-nne-ya.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


M'we nye ndi-ikpe-unu iwu na mb͕e ahu, si, Nānunu ikpé n'etiti umu-nne-unu, nēkpe-kwa-nu ikpe ezi omume n'etiti nwoke na nwa-nne-ya na ọbìa-ya.


Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.


Hu-kwa-nu ọbìa n'anya: n'ihi na ọ bu ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.


I gēcheta kwa na ọ bu orù ka i buri n'ala Ijipt, ma Jehova, bú Chineke-gi, b͕aputara gi: n'ihi ya ka mu onwem nēnye gi ihe a n'iwu ta.


ọ gēbiyere gi, n'etiti gi, n'ebe ahu nke ọ gārọputa n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n'ebe di ya nma: emela ya ihe-ike.


Akpọla onye Edom ihe árú; n'ihi na nwa-nne-gi ka ọ bu: akpọla onye Ijipt ihe-árú; n'ihi na ọbìa ka i buri n'ala-ya.


Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe:


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēwezuga ikpé nke ọbìa, na nke nwa-nb͕ei, na nke nwayi di-ya nwuru. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan