Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 22:20 - Bible Nso

20 Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 “Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 22:20
20 Iomraidhean Croise  

Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.


O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal.


na ime ka onye ọ bula nwua, ma ọ bu onye ntà ma-ọbu onye uku, ma-ọbu nwoke ma-ọbu nwayi, nke nāchọghi Jehova, bú Chineke Israel.


Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n'ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n'ihi na ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.


ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;


M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.


Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Jehova we ge nti n'olu Israel, nye ndi Kenean n'aka-ha; ha we wezuga ha na obodo nile ha ka ebibie ha: ewe kpọ aha ebe ahu Họma.


Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.


Ma onye-amuma nke gēwere nganga kwu okwu n'aham, nke M'nēnyeghi ya iwu ikwu, ma-ọbu nke gēkwu n'aha chi di iche iche ọzọ, onye-amuma ahu gānwu kwa.


Umu agāmuru ha, ọb͕ọ nke-atọ ha, gābà nime nkpọkọta Jehova.


Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan