Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 20:10 - Bible Nso

10 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na anu-ulo-gi, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 20:10
16 Iomraidhean Croise  

ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n'ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n'aka-ha n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n'ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula.


Ubọchi isi ka unu gāchikọta ya; ma n'ubọchi nke-asa ka ubọchi-izu-ike di, ọ dighi nke gādi nime ya.


Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N'ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n'ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ.


Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi: n'ilu-ọlu-ubi na n'owuwe-ihe-ubi i gākwusi.


Ubọchi isi ka agēje ozi, ma n'ubọchi nke-asa unu gēnwe ubọchi nsọ, bú ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēme ka ọ nwua.


N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem:


Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile.


Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite. N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan