Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 2:23 - Bible Nso

23 O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 2:23
31 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova si kwa ya, Le, gi onwe-gi di ime, i gaje imu nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-ya Ishmael, n'ihi na Jehova egewo nti na nweda-gi.


Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala.


I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie;


N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu; Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike.


Jehova, nuru ekperem, Ka ntikum ru kwa Gi nti.


Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.


N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nētiku: O nēsi n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.


ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.


Jehova we si Moses nime Midian, Je, laghachi n'Ijipt: n'ihi na ndikom ahu nile ndi nāchọ ndu-gi anwuruwo.


Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum.


Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike.


Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu.


Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n'ala Ijipt: n'ihi na ha gētiku Jehova n'ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha.


N'ihi na ubi-vine nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu ulo Israel, ndi Juda bu kwa ihe-ọkukú nātọ Ya utọ nke-uku: O we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; O lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.


ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:


Mb͕e ọgu arọ abua zuru, ewe me ka ọ hu mọ-ozi n'ọhia nke ugwu Sainai, n'ire ọku nime osisi ntà.


N'ubọchi-ya ka i gēnye ya ugwọ-ọlu-ya, anyanwu agaghi-adakpu kwa ya; n'ihi na onye ewedara n'ala ka ọ bu, nke ahu ka ya onwe-ya nātukwasi kwa nkpuru-obi-ya: ka o we ghara ikpọku Jehova megide gi, o we buru nmehie nime gi.


Le, ugwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi bìri ọka n'ubi-unu, nke unu jidere na nmeb͕u, nēti nkpu: iti-nkpu nke ndi ahu ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha.


Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.


Mb͕e Jekob batara n'Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta, me kwa ka ha biri n'ebe a.


Dika mb͕e a echi M'gēzitere gi otù nwoke sitere n'ala Benjamin, i gēte kwa ya manu ibu onye-ndú ndim, bú Israel, ọ gāzọputa kwa ndim n'aka ndi Filistia: n'ihi na ahuwom ndim, n'ihi na iti-nkpu-ha abàwom na nti.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan