Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 19:3 - Bible Nso

3 Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 19:3
12 Iomraidhean Croise  

Jehova we rida-kwasi ugwu Sainai, rue elu ugwu ahu: Jehova we kpọ Moses ibiaru elu ugwu ahu, Moses we rigo.


Ndi Israel we guzo n'ebe di anya, ma Moses biaruru oké ọchichiri ahu nso, ebe Chineke nọ.


Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.


Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.


Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a.


Jehova we hu na o wezugara onwe-ya ihu, Chineke we si n'etiti osisi ntà ahu kpọ ya òkù, si, Moses, Moses. Ọ si, Lekwam.


Nọ na njikere rue ututu, rigota n'ugwu Sainai n'ututu, guzorom onwe-gi ọtọ n'ebe ahu n'elu ugwu ahu.


Ọ we wa mbadamba nkume abua dika nke-mbu; Moses we bilie n'isi-ututu, rigorue ugwu Sainai, dika Jehova nyere ya iwu, o were kwa mbadamba nkume abua n'aka-ya.


Jehova we kpọ Moses òkù, si n'ulo-ikwū nzute gwa ya okwu, si,


Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan