Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 19:24 - Bible Nso

24 Jehova si ya, Je, rida; i gārigota kwa, gi onwe-gi, na Eron tiyere gi: ma ka ndi-nchu-àjà na ndim ghara inujuru irigokute Jehova, ka O we ghara itiwakuru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute Onyenwe anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 19:24
20 Iomraidhean Croise  

Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n'ihi na ehi nāb͕a ukwu.


I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n'ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua:


Moses we ridakuru ndi Israel, si ha me otú a.


Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya:


Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel:


Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.


Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.


Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike.


Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya.


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


n'ihi na iwu ahu nāluta iwe; ma ebe iwu nādighi, njehie adighi kwa.


Gini kwa bu iwu ahu? Atukwasiri ya n'ihi njehie, rue mb͕e Nkpuru ahu gābia, bú Onye ekweworo nkwa; esitekwara n'aka ndi-mọ-ozi nye iwu ahu site n'aka onye-ob͕ub͕o.


Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.


n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.


Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan