Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 19:19 - Bible Nso

19 Olu opì-ike ahu we nādasi ike nke-uku, Moses nēkwu okwu, Chineke were kwa olu nāza ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 19:19
9 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu:


Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah


ọ dighi aka gēmetu ya, n'ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n'àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n'ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n'ugwu a.


O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji.


ọnu na ọnu ka M'gāgwa ya okwu ọbuná n'ile-anya, ọ bughi kwa n'ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses?


N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.


Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.


na udà opì, na olu okwu; nke ndi nuru ya riọrọ ka aghara itukwasiri ha okwu ọ bula ọzọ:


ka ihe ahu anēkiri si di kwa egwu nke-uku, Moses siri, Anamatu oké egwu, aru ma-kwa-ram jijiji:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan