Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 19:17 - Bible Nso

17 Moses we me ka ndi Israel si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha puta izute Chineke, ha we guzo onwe-ha n'ala-ala nke ugwu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 19:17
8 Iomraidhean Croise  

ọ dighi aka gēmetu ya, n'ihi na aghaghi itub͕u ya na nkume, ma-ọbu ib͕ab͕u ya n'àkú; ma anumanu ma madu, ọ gaghi-adi ndu: n'ọfùfù-opì di anya ndi ahu gārigota n'ugwu a.


O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji.


Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.


Ha we weta ihe Moses nyere n'iwu n'iru ulo-ikwū nzute: nzukọ Israel nile we biaru nso guzo kwa n'iru Jehova.


Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n'ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n'ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n'ọnu Chineke puta inye ayi:


ubọchi nke i guzoro n'iru Jehova, bú Chineke-gi, nime Horeb, mb͕e Jehova sirim, Kpọkọtaram ndim, M'gēme kwa ka ha nu okwum nile, ka ha we muta itu egwum ubọchi nile nke ha onwe-ha nādi ndu n'elu ala, ka ha we zí kwa umu-ha.


Unu we biaru nso, guzo n'okpuru ugwu ahu; ugwu ahu nēre ọku rue obi elu-igwe, n'ọchichiri, na igwe-oji, na oké ọchichiri.


(mu onwem nēguzo n'etiti Jehova na unu na mb͕e ahu, igosi unu okwu Jehova: n'ihi na unu turu egwu n'ihi ọku ahu, unu arigoghi kwa n'ugwu ahu;) si,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan