Ọpụpụ 19:16 - Bible Nso16 O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji. Faic an caibideil |
ọ̀ bu Mu ka unu nādighi-atu egwum? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ọ̀ gaghi-eb͕u unu nb͕u n'ihi irum? Mu onye doworo ájá ibu ókè nke oké osimiri, site n'ukpuru ebighi-ebi, ọ gaghi-agabiga kwa ya, ọ bu ezie na nmali-miri-ya nile nāmaghari, ma ha apughi; ọ bu ezie na ha nēbib͕o, ma ha adighi-agabiga ya.