Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 19:15 - Bible Nso

15 Ọ si ndi Israel, Nọnu na njikere nye ubọchi nke-atọ: unu abiarula nwayi nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 19:15
16 Iomraidhean Croise  

si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya.


nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.


Moses we si n'ugwu ahu ridakuru ndi Israel, do ndi ahu nsọ; ha we su uwe-nbokwasi-ha.


O rue, n'ubọchi nke-atọ, mb͕e ọ bu ututu, na ọtútú éb͕è-elu-igwe na àmùmà di, na igwe-oji di arọ́ n'elu ugwu ahu, na olu opì-ike di ike nke-uku; ndi Israel nile ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū-ha we ma jijiji.


menu ka ndi Israel zukọta, donu nkpọkọta Israel nsọ, chikọtanu ndi-okenye, menu ka umu-ntakiri na ndi nāṅu ara zukọta: ka onye nālu nwunye ọhu si n'ime-ulo-ya puta, ka nwunye ọhu si kwa n'ulo-ndina-ya puta.


Nwayi kwa, onye nwoke nēdinayere, nke ọ rara aru n'aru-ya, ha abua gēwere miri sa aru-ha, ha gāru kwa árú rue anyasi.


N'ihi nka ka M'gēme gi otú a, gi Israel: ebe ọ bu nka ka M'gēme gi, jikere izute Chineke-gi, gi Israel.


n'ub͕ọ-ala nke-atọ ka inyinya nācha ọcha di; n'ub͕ọ-ala nke-anọ ka inyinya turu agwa nwe-kwa-ra ume di.


na igwa ndi-nchu-àjà ndi diri ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha okwu, ha na ndi-amuma, si, M'gākwa ákwá n'ọnwa nke-ise, nēkewaputa onwem, dika m'meworo otutu aro ra ka ndia?


Ma ònye gānagide ubọchi ọbibia-Ya? ọ̀ bu kwa onye ganēguzogide mḅe anāhu Ya anya? n'ihi na Ya onwe-ya di ka ọku onye-nnucha-ihe na dika nchà nke ọsu-ákwà:


N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.


Unu emeb͕ula onwe-unu, ma-ọbughi ma eleghi anya unu gēsite n'inwe otù olu me ya na nwa oge, ka unu we nwe oghere ikpe ekpere, we nọkọ kwa ọzọ, ka Setan we ghara inwa unu n'ihi na unu apughi ijide onwe-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan