Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 19:12 - Bible Nso

12 I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n'ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 19:12
11 Iomraidhean Croise  

Fero we si ya, Pua n'arum la, lezie onwe-gi anya, ahula irum ọzọ; n'ihi na n'ubọchi i huru irum ka i gānwu.


Jehova we si Moses, Rida, b͕ara ndim àmà, ka ha we ghara inujuru n'ebe Jehova nọ ile anya, ọtútú nime ha we da.


Moses we si Jehova, Ndi-Gi apughi irigoru ugwu Sainai: n'ihi na Gi onwe-gi b͕ara ayi àmà, si, Kpara ugwu a ókè, do kwa ya nsọ.


ma nání Moses onwe-ya gābiakute Jehova nso; ma ha onwe-ha agaghi-abiaru nso; ndim agaghi-eso kwa ya rigota.


Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi:


Ọ dighi kwa onye ọ bula gēsoro gi rigota, ọzọ kwa, ka aghara ihu onye ọ bula n'ugwu ahu nile; ọzọ, ìgwè ewu na aturu ma -ọbu ìgwè ehi atala nri n'akuku ugwu ahu.


Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku:


Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;


N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,


Nání, ókè gādi n'etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n'ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n'ihi na unu agabigaghi n'uzọ a na mb͕e gara aga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan