Ọpụpụ 19:12 - Bible Nso12 I gākpara ndim ókè buruburu, si, Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara irigo n'ugwu a, ma ọbu imetu nsọtu-ya aka: onye ọ bula nke nēmetu ugwu a aka, aghaghi ime ka ọ nwua: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’ Faic an caibideil |