Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 18:8 - Bible Nso

8 Moses we kọrọ nna nwunye-ya akukọ ihe nile Jehova mere Fero na ndi Ijipt n'ihi Israel, ike-ọgwugwu nile nke gwuru ha n'uzọ, Jehova we naputa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 18:8
23 Iomraidhean Croise  

N'ihi na m'gesi aṅa rigokuru nnam, ma nwa-okoro a esoghm rigo? ka m'we ghara ilekwasi ihe ọjọ ahu anya nke gāchọta nnam.


Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.


O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì, B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha.


Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya.


Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a, Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u;


Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke, M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.


Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah


Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha; N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume; Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova, Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.


Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.


umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua.


Ma Jetro, bú onye-nchu-àjà Midian, nna nwunye Moses, nuru ihe nile Chineke mere Moses na Israel ndi-Ya, na Jehova mere ka Israel si n'Ijipt puta.


Chineke we hu umu Israel, Chineke we mara.


N'ihi na mọ-ozim ganēje n'iru gi, me ka i bakute ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Kenean, na ndi-Haivait, na ndi Jebus: M'gēzopu kwa ha n'uwa.


M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.


Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta.


Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta.


Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan