Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 18:25 - Bible Nso

25 Moses we si n'etiti Israel nile rọputa ndi-dìnkpà, me ha ka ha buru ndi-isi ndi ahu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 18:25
9 Iomraidhean Croise  

ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.


Devid we gukọta ndi ya na ha nọ, do ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu ọgu ndikom ise ichi ha.


Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:


Moses we ge nti n'olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri.


Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu.


Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu.


Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu.


Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:


M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan