Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 18:19 - Bible Nso

19 Ub͕u a ge nti n'olum, m'gādu gi ọdu, ka Chineke nọyere kwa gi: gi onwe-gi buru ndi nka na ncherita-iru Chineke, gi onwe-gi webata-kwa-ra Chineke okwu nile,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 18:19
15 Iomraidhean Croise  

Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu.


Nwayi nējere gi ozi we si, Biko, ka okwu onye-nwem, bú eze, diri izu-ike: n'ihi na dika mọ-ozi nke Chineke, otú a ka onye-nwem, bú eze, di inu ezi ihe na ihe ọjọ: Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi.


Moses we si nna nwunye-ya, N'ihi na ndi nka nābiakutem iju Chineke ase:


me kwa ka ha ghọta ukpuru nile na iwu nile, gi me kwa ka ha mara uzọ ha gēje ije nime ya, na ọlu nke ha gālu.


Moses we ge nti n'olu nna nwunye-ya, me ihe nile ọ siri.


Ha si Moses, Gi onwe-gi kpayere ayi uka, ayi gānu kwa: ma Chineke akpayerela ayi uka, ka ayi we ghara inwu.


Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a.


Ma ub͕u a, je, Mu onwem gānọyere ọnu-gi, zí gi ihe i gēkwu.


Ya onwe-ya gāgwara gi ndim okwu: ọ gēru kwa, na ya onwe-ya gāburu gi ọnu, gi onwe-gi gābu-kwa-ra ya Chineke.


Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari: Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.


Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


(mu onwem nēguzo n'etiti Jehova na unu na mb͕e ahu, igosi unu okwu Jehova: n'ihi na unu turu egwu n'ihi ọku ahu, unu arigoghi kwa n'ugwu ahu;) si,


Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan