Ọpụpụ 18:12 - Bible Nso12 Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke. Faic an caibideil |
Umu-nne-ya ndikom nile, na umu-nne-ya ndinyom nile, na ndi nile mara ya na mb͕e gara aga, we biakute ya, so ya rie nri n'ulo-ya: ha we gosi ya ebere ha ji n'aru ya, kasi kwa ya obi bayere ihe ọjọ ahu nile nke Jehova mere ka ọ biakwasi ya: ha we nye ya, nwoke ọ bula otù iberibe ego, na nwoke ọ bula otù nb͕a-aka ọla-edo.
Ma ub͕u a, chirinu n'onwe-unu oke-ehi asa na ebulu asa, jekuru orùm, bú Job, surere onwe-unu àjà-nsure-ọku; Job, bú orùm, gēkpe kwa ekpere bayere unu; n'ihi na n'ezie ọ bu ya ka M'gāhu iru-ọma, ka M'ghara imeso unu dika nzuzu-unu si di; n'ihi na unu ekwughi ihe ziri ezi bayerem, dika orùm, bú Job, kwuru.