Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 17:9 - Bible Nso

9 Moses we si Joshua, Rọputara ayi ndikom, pua, buso Amalek agha; echi mu onwem ganēguzo onwem n'elu ugwu ntà nka, nējide nkpa-n'aka Chineke n'akam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 17:9
18 Iomraidhean Croise  

Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya.


Joshua we me ka ike gwu Amalek n'ọnu mma-agha.


Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:


Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.


Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua.


Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.


Jehova we si ya, Gini bu ihe ahu di n'aka-gi? Ọ si, Nkpa-n'aka.


Moses we chiri nwunye-ya na umu-ya ndikom, me ka inyinya-ibu buru ha, ọ we laghachi n'ala Ijipt: Moses we were nkpa-n'aka Chineke n'aka-ya.


Joshua nwa Nun, onye nējere Moses ozi, bú otù onye nime ndikom-ya arọputaworo, we za, si, Onye-nwem Moses, b͕ochie ha.


Ndia bu aha ndikom ahu nke Moses zigara iledo ala ahu. Moses we kpọ Hoshia nwa Nun Joshua.


Nke diri ebo Efraim bu Hoshia nwa Nun.


Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi;


Nke, mb͕e o ruru ha aka, nna-ayi-hà na Joshua bubatara, mb͕e ha natara ala nke mba nile ahu, ndi Chineke nupuru n'iru nna-ayi-hà, rue ubọchi Devid;


Moses we bia, kwue okwu nile nke abù a na nti ndi Israel, ya onwe-ya, na Hoshea nwa Nun.


N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.


Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n'aka-gi n'ebe Ai di; n'ihi na n'aka-gi ka M'gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n'aka-ya n'ebe obodo ahu di.


Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n'abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan