Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 17:7 - Bible Nso

7 O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n'ihi ise-okwu nke umu Israel, na n'ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n'etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere Onyenwe anyị, na-asị, “Onyenwe anyị ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 17:7
21 Iomraidhean Croise  

Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba, O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha:


Ha we nwa Chineke n'obi-ha N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.


Na nkpab͕u i kpọkurum, M'we naputa gi; Anamaza gi n'ebe-nzuzo nke éb͕è-elu-igwe; Anamanwa gi n'akuku miri Meriba. Selah


Nuru, ndim, M'gāb͕a àmà megide gi: Israel, ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na i gēgem nti!


Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba, Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:


Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova?


Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa.


Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n'ihi na onye uku n'etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.


Ndi-isi-ya nēkpe ikpe n'ihi iri-ngo, ndi-nchu-àjà-ya nēzí ihe n'ihi ugwọ, ndi-amuma-ya nāju ase n'ihi ego: ma na Jehova ka ha nādabere, si, Jehova, Ọ̀ nọghi n'etiti ayi? ihe ọjọ agaghi-abiakwasi ayi.


n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;


Ndia bu miri Meriba; n'ihi na umu Israel soro Jehova se okwu, ewe do Ya nsọ nime ha.


Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.


n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin.)


Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.


Iwem gādi kwa ọku megide ha n'ubọchi ahu, M'gārapu kwa ha, zopu irum n'aru ha, ha gābu kwa ihe agēri eri, ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta kwa ha; ha gāsi kwa n'ubọchi ahu, Ọ̀ bughi n'ihi na Chineke-ayi anọghi n'etiti ayi ka ihe ọjọ ndia chọtaworo ayi?


Ọ we kwue ihe bayere Livai, si, Izu-okè-Gi na Ìhè-Gi diri onye-ebere-Gi, Onye I nwara na Masa, Onye Gi na ya nēse okwu n'akuku miri Meriba;


Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.


Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe.


Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si umu Reuben, si kwa umu Gad, si kwa umu Manase, Ta ka ayi mara na Jehova nọ n'etiti ayi, n'ihi na unu emekpughi ihe-nmekpu a megide Jehova: ub͕u a ka unu naputaworo umu Israel n'aka Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan