Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 17:2 - Bible Nso

2 Ndi Israel we so Moses se okwu, si, Nyenu ayi miri ka ayi ṅua. Moses we si ha, Gini mere unu som nēse okwu? gini mere unu nānwa Jehova?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.” Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi Onyenwe anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 17:2
32 Iomraidhean Croise  

Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa; Ha echeghi ndum-ọdu-Ya:


Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara, We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu.


Ha we nwa Chineke n'obi-ha N'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.


Ha we chigharia, we nwa Chineke, Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.


Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya, Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;


Unu emela ka obi-unu sie ike, dika na Meriba, Dika n'ubọchi Masa n'ọzara:


Mb͕e nna-unu-hà nwaram, Nwaputam ìhè, hu kwa ọlum.


Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu?


Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.


O we kpọ aha ebe ahu Masa, na Meriba, n'ihi ise-okwu nke umu Israel, na n'ihi na ha nwara Jehova, si, Jehova, Ọ̀ nọ n'etiti ayi, ma-ọbu na Ọ nọghi?


ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.


Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova.


Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.


Umu Israel nile we tamue ntamu megide Moses, megide kwa Eron: nzukọ ahu nile we si ha, Ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo n'ala Ijipt, ma-ọbu n'ọzara nka! ọ gādi ayi nọ nma ma asi na ayi anwuruwo!


n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;


Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.


Jisus siri ya, Ọzọ kwa edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.


nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri.


Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.


Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru?


Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi.


Ka ayi ghara kwa inwa Onye-nwe-ayi, dika ufọdu n'etiti ha nwara, agwọ we la ha n'iyì.


Unu anwala Jehova, bú Chineke-unu, dika unu nwara Ya nime Masa.


Ọ bu kwa nime Tabera, na nime Masa, na nime Kibrot-hataava, ka unu bu ndi nākpasu Jehova iwe.


Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem, Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.


Ma okwu ahu jọrọ njọ n'anya Samuel, mb͕e ha siri, Nye ayi eze ikpe ayi ikpe. Samuel we kpere Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan