Ma aka Moses abua di arọ́; ha we were nkume, tiye ya n'okpuru ya, ọ nọkwasi ya; Eron na Hua we jide aka-ya abua elu, otù onye n'otù akuku, ibe-ya n'akuku ọzọ; aka-ya abua we nēguzosi ike rue ọdida-anyanwu.
Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.
Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.
ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.
Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.