Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 16:23 - Bible Nso

23 Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 16:23
16 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa n'elu ugwu Sainai ka I ridara, si n'elu-igwe kpayere ha uka, I we nye ha ikpé ziri ezi na iwu ezi-okwu, na ezi ukpuru na ihe enyere n'iwu:


I me-kwa-ra ka ha mara ubọchi-izu-ike nsọ Gi, I were kwa ihe enyere n'iwu, na ukpuru, na iwu, nye ha n'iwu site n'aka Moses, bú orù-Gi:


Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.


Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi n'ọlu: ka ehi-gi na inyinya-ibu-gi we zuru ike, ọzọ, ka nwa nke orù-gi nwayi na ọbìa we turu ndu.


Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua.


unu agaghi-ebupu kwa ibu n'ulo-unu n'ubọchi-izu-ike, ọ bu kwa ozi ọ bula ka unu nāgaghi-eje: ma donu ubọchi-izu-ike nsọ, dika M'nyere nna-unu-hà iwu;


Ubọchi isi ka agēje ozi: ma n'ubọchi nke-asa, ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādi, bú nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ubọchi-izu-ike nke Jehova nwere ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile.


Ma manna ahu, dika nkpuru coriander ka ọ bu, iru-ya di kwa ka iru bdellium.


Ndi Israel jeghariri, chikọta ya, were nkume-igwe-nri gwe ya, ma-ọbu na ha suru ya n'ikwè, we sie ya n'ite, me ya ka ọ buru ob͕e achicha: idetu ya ire ọ di ka idetu ihe eji manu si esi.


Ha we laghachi, dozie uda utọ di ichi iche na manu-otite. N'ubọchi-izu-ike ha we nọdu nwayọ dika ihe enyere n'iwu si kwu.


Debe ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu.


Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan