Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt; Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile; Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie.
Akpiri miri we kpọ ndi Israel nku n'ebe ahu; ndi ahu we tamu ntamu megide Moses, si, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i meworo ka ayi si n'Ijipt rigota, iwere akpiri-ikpọ-nku me ka ayi na umu-ayi na anu-ulo-ayi, nwua?
ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.
n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;