Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 16:12 - Bible Nso

12 Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N'etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n'ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 16:12
17 Iomraidhean Croise  

Onye nke Chineke we biarue nso, gwa eze Israel okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na Siria asiwo, Chi ugwu ka Jehova bu, ma Ọ bughi chi ndagwurugwu; n'ihi ya ka M'gēnye ìgwè uku a nile n'aka-gi, unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova.


Ha riọrọ, O we me ka nnunu quail bia, O were kwa nri nke elu-igwe me ka afọ ju ha.


ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n'etiti ehihie na anyasi.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


ka ha we kwe na Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, emewo gi ka i hu Ya.


M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.


Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.


Juda na obodo-ya nile gēbikọ nime ya n'otù; ndi-ubi, na ndi nāchiri ìgwè aturu-ha bulie ije.


Ha ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, bú Chineke-ha, nọyere ha, ha mara kwa na ha onwe-ha bu ndim, bú ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Unu we were ọnu-unu me onwe-unu ka unu di uku imegidem, me ka okwu-unu ba uba imegidem: Mu onwem anuwo.


Ulo Israel ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, site n'ubọchi ahu we ga n'iru.


Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.


N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu.


M'gēme kwa ka uzọ nke-atọ ba n'ọku, M'gānucha kwa ha dika esi anucha ọla-ọcha, nwa ha dika esi anwa ọla-edo: ndi ahu gākpọku aham, Mu onwem gāza kwa ha: M'gāsi, Ndi nkem ka ọ bu; ndi ahu gāsi kwa, Jehova bu Chinekem.


Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n'etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu?


Rùe ole mb͕e ka M'gānagide nzukọ ọjọ nka nke nātamu ntamu megidem? ntamu nile nke umu Israel, nke ha onwe-ha nātamu megidem, ka M'nuworo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan