Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 15:9 - Bible Nso

9 Onye-iro siri, M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara: Nkpuru-obim gējuputa na ha, M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 15:9
15 Iomraidhean Croise  

Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.


Ka m'chua ndi-irom, we kpochapu ha; Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia.


Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi.


Ben-hedad we zigara ya ozi, si, Ka chi mem otú a, ka ha mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ájá Sameria gēzu nju-aka inye ndi nile nọ n'ukwum.


Ewe gosi eze Ijipt na ndi Israel ab͕alagawo: obi Fero na ndi-orù-ya we chigharia imegide ndi Israel, ha si, Gini bu nka ayi meworo, na ayi ezipuwo Israel n'ifè ayi?


Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala, Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.


Òle ndi n'etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam?


N'ihi nka ka M'gēkère ya òkè n'etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n'agha; n'ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.


Ha kpọrọ nkpu n'ebe ahu, si, Fero, bú eze Ijipt, bu nání nkpọtu; o kwerewo ka mb͕e akara àkà gabiga.


I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.


ma mb͕e ọ bula onye ka ya ike gābia imegide ya, meri kwa ya, ọ nara ya ihe-agha-ya dum nke ọ tukwasiriri obi-ya, keri kwa ihe ọ nara ya.


Hà achọtaghi? hà ekèghi ihe-nkwata? Otù nwa-ab͕ọghọ, umu-ab͕ọghọ abua, gādiri nwoke ọ bula, n'isi n'isi; Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji, diri Sisera, Ihe-nkwata, bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma, Bú uwe esijiri esiji nke akpara nke-ọma n'akuku abua, nke diri olu ndi akwatara?


Devid we jua Jehova ase, si, Ọ buru na achuam usu a ndi nāpunara madu ihe n'azu, #m'gēru ha aru? Ọ si ya, Chua: n'ihi na i ghaghi iru ha aru, i ghaghi kwa inaputa ha ihe nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan