O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.
Moses we si Chineke, Le, mb͕e mu onwem nābiakute umu Israel, si ha, Chineke nke nna-unu-hà ezitewom n'ebe unu nọ; mb͕e ha gāsikwam, Gini bu aha-Ya? ọ̀ bu gini ka m'gāsi ha?
Chineke si-kwa-ra Moses ọzọ, Otú a ka i gāsi umu Israel, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, O zitewom n'ebe unu nọ: nka bu aham rue mb͕e ebighi-ebi, nka bu kwa ihe-nchetam rue ọb͕ọ nile.