Ọpụpụ 15:27 - Bible Nso27 Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a27 Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ. Faic an caibideil |
Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.