ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.
n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;
Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu.
Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.
N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri, ma-ọbu ihe unu gāṅu; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. Ọ̀ bughi ndu kariri ihe eji azù ya, ọ̀ bughi kwa aru kariri uwe-oyiyi-ya?