Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 15:22 - Bible Nso

22 Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mgbe ihe ndị a mesịrị, Mosis nọgidere na-edu ụmụ Izrel. Ha sitere nʼOsimiri Uhie ahụ bilie ije, jeruo ọzara Shua. Ha jere ije nʼime ọzara abalị atọ, ma ha achọtaghị mmiri ọṅụṅụ

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 15:22
12 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova we hu ya n'akuku isi-iyi miri ahu di n'ọzara, n'akuku isi-iyi ahu di n'uzọ Shua.


Abraham we si n'ebe ahu bulie ije n'uzọ ala Negeb, biri n'etiti Kedesh na Shua; ọ we nọ dika ọbìa nime Gera.


Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n'iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n'iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada.


Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.


I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.


O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu, Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.


O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu: Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.


Nzukọ nile nke umu Israel we si n'ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n'okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu.


Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.


Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara.


Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n'iru Ijipt.


Devid na ndikom-ya we rigo, made imegide ndi Geshua, na ndi-Giazait, na ndi Amalek: n'ihi na ndi ahu bu ndi bi n'ala ahu, ndi sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ebe i nābà na Shua, we rue n'ala Ijipt.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan