Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 15:20 - Bible Nso

20 Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Nʼoge ahụ, Miriam onye amụma nwanyị, nwanne Erọn weere ịgba iti egwu nʼaka ya, duo ndị inyom ndị so ya, jiri ịgba egwu nke ha na-etekwa egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 15:20
33 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?


Unu egosila ya nime Gat, Unu ezisala ozi-ya n'èzí nile nke Ashkelon; Ka umu-ndinyom ndi Filistia we ghara iṅuri ọṅu, Ka umu-ndinyom nke ndi anēbìghi úgwù we ghara iṅuri ọṅu-agha.


Devid were kwa ike-ya nile te egwún'iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n'ukwù.


O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya.


Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà.


Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.


Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.


Umu Amram kwa; Eron, na Moses, na Miriam. Umu-ndikom Eron kwa; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama.


Chinekem, cheta Tobaia, cheta kwa Sanbalat, dika omume-ha ndia si di, ọzọ kwa, cheta Noadia, bú onye-amuma-nwayi, cheta kwa ndi-amuma fọduru, ndi nēme ka m'tua egwu.


Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma.


Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya:


I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú; I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké:


Onye-nwe-ayi nēnye okwu: Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.


Ndi-abù buru uzọ ga, ndi-ubọ-akwara soro n'azu, N'etiti umu-ab͕ọghọ ndi nēti egwú-otiti.


Nime nkpọkọta nile nke madu gọzienu Chineke, Bú Onye-nwe-ayi, unu ndi sitere n'isi-iyi Israel.


Bulienu abù ọma, weta kwa egwú-otiti, Na ubọ-akwara di utọ, ya na une.


Nwa-nne-ya nwayi we guzo onwe-ya n'ebe di anya, imara ihe gēme ya.


mb͕e ikwa ákwá, na mb͕e ichì ọchì; mb͕e iru újú, na mb͕e ite egwú;


M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.


N'ihi na M'mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n'ulo ndi-orù ka M'b͕aputara gi; M'we ziga Moses na Eron na Miriam iga n'iru gi.


Miriam na Eron we kwue okwu megide Moses n'ihi nwayi Etiopia ahu ọ lutara: n'ihi na nwayi Etiopia ka ọ lutara.


Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya.


Umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we ba n'ọzara Zin n'ọnwa mbu: ndi Israel we nọdu na Kedesh; Miriam we nwua n'ebe ahu, ewe lìe ya n'ebe ahu.


Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi.


Otù onye anākpọ Ana di kwa, bú onye-amuma-nwanyi, nwa-nwanyi Fanuel, nke si n'ebo Asha puta (nwanyi a aghọwo ezi agadi, ebe ya na di-ya biri arọ asa site na nwa-ab͕ọghọ-ya,


Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma.


Ma nwanyi ọ bula, mb͕e ọ dighi-ekpudo ihe n'isi-ya n'ikpe ekpere ma-ọbu n'ibu amuma, ọ nēme ka ihere me isi-ya: n'ihi na ya na nwanyi nke akọpuworo isi-ya bu otù ihe ahu.


Ka ndinyom-unu kpuchie ọnu-ha nime nzukọ-unu: n'ihi na ekweghi ha ka ha kwue okwu; kama ka ha do onwe-ha n'okpuru ike, dika iwu Chineke nēkwu kwa.


Jefta we bia Mizpa rue ulo-ya, ma, le, nwa-ya nwayi chiri egwú-otiti na ite-egwú nāputa izute ya: ma nání nwata ahu bu otù nwa o nwere; ọ dighi nwa-nwoke ma-ọbu nwa-nwayi o nwere ma-ọbughi nání ya.


hu-kwa-nu, ma, le, ọ buru na umu-ndinyom Shailo aputa ite egwú nime otiti-egwú-ha, unu gēsi kwa n'ubi-vine puta, nwudere onwe-unu, nwoke ọ bula nwunye-ya, site n'umu-ndinyom Shailo, la n'ala Benjamin.


Ma Debora, bú nwayi nke bu onye-amuma, bú nwunye Lapidot, ya onwe-ya nēkpe Israel ikpe na mb͕e ahu.


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan