Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 15:1 - Bible Nso

1 Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, Mosis na ụmụ Izrel bụkuru Onyenwe anyị abụ dị otu a sị, “Aga m abụku Onyenwe anyị abụ nʼihi na o buliela onwe ya elu nke ukwuu. Ọ tụnyela ịnyịnya na onye na-agba ya nʼosimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 15:1
27 Iomraidhean Croise  

I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.


Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku, Bú nke madu bùworo abù bayere ya.


O we me ka ndi-Ya ji obi-utọ puta, Me kwa ndi Ọ rọputaworo ka ha ji iti-nkpu-ọṅù puta.


Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya.


Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!


Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!


Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu; Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah


Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob, Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.


Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?


Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu oké osimiri, miri ahu gālata kwa n'aru ndi Ijipt, n'aru ub͕ọ-ala-ha, na n'aru ndi-inyinya-ha.


Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri, oké osimiri ahu we lata n'orùrù o nērù mb͕e nile mb͕e chi bọrọ; ndi Ijipt we nāb͕apu n'ọbibia-ya; Jehova we richapu ndi Ijipt n'etiti oké osimiri.


Miriam we za ha, si, Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku; Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.


Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.


Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di: Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.


Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.


ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia inyinya na onye nānọkwasi ya; ọ bu kwa gi ka M'gēji tipia ub͕ọ-ala na onye nānọkwasi ya;


M'gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n'ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n'aha-ha ọzọ.


Ma mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova, M'gēteghari egwú ọṅù nime Chineke nke nzọputam.


Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si: Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya:


mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya.


Ha nābù kwa abù nke Moses, bú orù nke Chineke, na abù nke Nwa-aturu Chineke, si, Ọlu-Gi nile di uku di kwa ebube, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile; uzọ-Gi nile ziri ezi, buru kwa ezi-okwu, Gi Eze nke mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan