Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 14:3 - Bible Nso

3 Fero gēkwu kwa okwu bayere umu Israel, si, Ndi atuhiworo n'ala ka ha bu, ọzara emechibidowo ha nime.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 14:3
15 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.


N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.


Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si, Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke.


Si, Chineke arapuwo ya: Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.


Gwa umu Israel ka ha chigharia, ma ulo-ikwū-ha n'iru Pai-hahairot, n'etiti Migdol na oké osimiri, n'iru Beal-zefon: na ncherita-iru ya ka unu gāma ulo-ikwū-unu n'akuku oké osimiri.


M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?


ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta.


O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.


Ewe gwa ndi Geza, si, Samson abiawo ebe a. Ha we b͕a ya buruburu, che ya anwu abali ahu nile n'ọnu-uzọ-ama obodo, nọdu du abali ahu nile, si, Ka ọ di rue ìhè ututu, ayi we b͕ue ya.


Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.


Ewe gosi Sọl na Devid abàwo na Keila. Sọl we si, Chineke ajuwo ya, rapu ya n'akam; n'ihi na emechibidowo ya nime, n'ibà n'obodo nwere ibo ọnu-uzọ-ama na nkpọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan