Ọpụpụ 14:25 - Bible Nso25 O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a25 O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.” Faic an caibideil |
N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.
Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.