Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 14:24 - Bible Nso

24 O rue, nime iche-nche ututu, na Jehova lere ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt anya n'ogidi ọku na igwe-oji, chusa ọmuma-ulo-ikwū ndi Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 14:24
16 Iomraidhean Croise  

I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?


N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali; Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa, Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.


Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe? Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya? Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:


Hu onye-npako ọ bula, me ka o ruru ala; Zọpia kwa ndi nēmebi iwu n'ọnọdu-ha.


Onye nēlegide uwa, o we ma jijiji; Ọ nēmetu ugwu aka, ha we kwua anwuru-ọku.


Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru; Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.


O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.


N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-Gi Di ka nnyahuru mb͕e ọ nāga, Na dika otù nche n'abali.


Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali:


O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.


Ọ buru kwa na ha ala nime ndọta-n'agha n'iru ndi-iro-ha, site n'ebe ahu ka M'gēnye mma-agha iwu, o we b͕ue ha: M'gātukwasi kwa ha anyam abua ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha ezi ihe.


O rue, n'echi-ya, na Sọl doro ndi Israel n'usu atọ; ha we ba n'etiti ọmuma-ulo-ikwū n'iche-nche ututu, tib͕ue Amon rue ikpo-ọku nke ehihie: o rue, na ndi fọduru b͕asara, ọ fọdughi kwa ndikom abua n'otù ebe n'etiti ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan