Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 14:20 - Bible Nso

20 ọ we bata n'etiti ọmuma-ulo-ikwū Ijipt na ọmuma-ulo-ikwū Israel; igwe-oji ahu na ọchichiri ahu we di, ma ọ nēnye ìhè n'abali: otù abiarughi kwa nso ibe-ya n'abali ahu nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Nke a mere ka ogidi igwe ojii ahụ dịrị nʼetiti ụmụ Izrel na ndị Ijipt. Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ogidi igwe ojii ahụ nye ụmụ Izrel ìhè, ma ndị Ijipt nọgidere nʼọchịchịrị. Otu a, ndị Ijipt enweghị ike bịarute nʼebe ụmụ Izrel nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 14:20
9 Iomraidhean Croise  

Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu; Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé.


O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu: Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.


Mọ-ozi nke Chineke, nke nēje n'iru ọmuma-ulo-ikwū nke Israel, we bulie ije, je n'azu ha; ogidi igwe-oji ahu we si n'iru ha bulie ije, guzo n'azu ha:


Moses we setipu aka-ya n'elu oké osimiri; Jehova we were ifufe Iru-anyanwu di ike me ka oké osimiri ahu je n'azu n'abali ahu nile, Ọ we me oké osimiri ahu ka ọ buru ala-akọrọ, ewe kewa miri ahu.


N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel.


Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà.


Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan