ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n'iru ìgwè madu a bara uba; n'ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe.
Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.
M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.
I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.
O wezuga akpuru ukwu nke ub͕ọ-ala-ha, me ka ọ di ha arọ́ ime ka ha nāga: ndi Ijipt we si, Ka ayi b͕apu n'iru Israel; n'ihi na Jehova nēburu ha agha megide ndi Ijipt.
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, siri, Nime nlata na izu-ike ka agāzọputa unu; n'inọ-jū na n'itukwasi-obi ka idi-ike-unu gādi: ma unu ekweghi.
unu onwe-unu ahuwo kwa ihe nile nke Jehova, bú Chineke-unu, meworo mba ndia nile n'ihi unu; n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, Ya onwe-ya bu onye nāluru unu ọ̀gù.
Ndi Filistia we tua egwu, n'ihi na ha siri, Chineke abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. Ha we si, Ahuhu nādiri ayi! n'ihi na ihe dika nka adighi na mb͕e gara aga.