Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 14:11 - Bible Nso

11 Ha si Moses, Ọ̀ bu n'ihi na ílì adighi n'Ijipt na i chipuwo ayi inwu n'ọzara? gini bu nka i meworo ayi, n'ime ka ayi si n'Ijipt puta?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ha jụrụ Mosis sị, “Ọ bụ na o nweghị ili dị nʼala Ijipt, i ji kwagide anyị ka anyị niile bịa nwụọ nʼebe a nʼọzara? Gịnị mere i ji kwagide anyị ka anyị hapụ Ijipt?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 14:11
14 Iomraidhean Croise  

Israel we si, N'ìhi gini ka unu mejọrọm, n'igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ?


O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n'uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n'ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n'Ijipt:


Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.


ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.


Moses we laghachikuru Jehova, si, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka I mejọworo ndi nka? ọ̀ bu n'ihi gini bu nka na I zitewom?


Ndi Israel we di ka ndi nātamu ntamu, nēkwu ihe ọjọ na nti Jehova: Jehova we nu ya, iwe-Ya we di ọku; ọku nke Jehova we re n'etiti ha, we ripia madu ufọdu nime nsọtu ọmuma-ulo-ikwū.


Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.


n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;


Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n'echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan