Gwa umu Israel ka ha chigharia, ma ulo-ikwū-ha n'iru Pai-hahairot, n'etiti Migdol na oké osimiri, n'iru Beal-zefon: na ncherita-iru ya ka unu gāma ulo-ikwū-unu n'akuku oké osimiri.
M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie.