Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 13:21 - Bible Nso

21 Ma Jehova nēje n'iru ha n'ehihie n'ogidi igwe-oji, iduru ha n'uzọ; na n'abali n'ogidi ọku, inye ha ìhè; ka ha we nēje ehihie na abali:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Onyenwe anyị ji ogidi igwe ojii na-eje nʼihu ha nʼehihie, idu ha nʼụzọ ha niile. Nʼabalị, o ji ogidi ọkụ, inye ha ìhè ka ha nwee ike ịga njem nʼehihie nakwa nʼabalị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 13:21
21 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.


ma Gi onwe-gi n'ọtutu obi-ebere-Gi arapughi ha n'ọzara: ogidi igwe-oji esighi n'elu ha wezuga onwe-ya n'ehihie, idu ha n'uzọ-ha; ogidi ọku ewezugaghi kwa onwe-ya n'abali, inye ha na uzọ ahu nke ha nēje ije nime ya ìhè.


Ọ b͕asara igwe-oji ibu ihe-nkpuchi; Na ọku inye ìhè n'abali.


Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi, Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah


I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.


O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.


N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu: Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.


Ọ si ha, Ka Jehova diyere unu otú a, dika m'gēzipu unu na umu-ntakiri-unu: lenu anya, n'ihi na ihe ọjọ di n'iru unu.


O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.


Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.


Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku, Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense, Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?


Igwe-oji nke Jehova we di n'elu ha n'ehihie, mb͕e ha si n'ọmuma-ulo-ikwū bulie ije.


ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali.


Onye nēje n'iru unu n'uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n'ọku n'abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n'igwé-oji ahu n'ehihie.


Jehova kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n'iru gi; Ọ gānọyere gi, Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi: atula egwu, atu-kwa-la ujọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan