Ọpụpụ 13:17 - Bible Nso17 O rue, mb͕e Fero zipuru ndi Israel, na Chineke edughi ha n'uzọ ala ndi Filistia, ọ bu ezie na nke ahu di nso; n'ihi na Chineke siri, Ka ndim we ghara icheghari uche mb͕e ha huru agha, we laghachi n'Ijipt: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a17 Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa. Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.” Faic an caibideil |
ha we ju inu ihe, ha echetaghi kwa oké ọlu-Gi nile nke I luru n'etiti ha; ha we kwesie olu-ha ike, do onye-isi nime nnupu-isi-ha ilaghachi n'ọbubu-orù-ha: ma Gi onwe-gi bu Chineke nke nb͕aghara nmehie, Onye nēme amara nwe kwa obi-ebere, Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Onye nāba uba n'ebere, I rapughi kwa ha.