Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 13:11 - Bible Nso

11 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme ka i ba n'ala ndi Kenean, dika Ọ ṅuru gi na nna-gi-hà iyi, mb͕e Ọ gēnye kwa gi ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 13:11
7 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis:


M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya.


N'ihi na O chetara okwu nsọ Ya, Na Abraham, bú orù-Ya.


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka.


Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ̀ bu mu onwem turu ime ndi nka nile? ọ̀ bu mu onwem muru ha, na I nāsim, Kuru ha n'obi-gi, dika nna-nāzù-nwa si eku nwa nāṅu ara, rue ala ahu nke I ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan