Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n'etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.
Ma mb͕e ọbìa gānọ n'etiti unu dika ọbìa, me-kwa-ra Jehova ememe ngabiga; dika ukpuru ngabiga ahu si di, na dika ikpé-ya si di, otú a ka ọ gēme: otù ukpuru ka unu gēnwe, ma ọbìa, ma onye amuru n'ala.
Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.
ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.