Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 12:2 - Bible Nso

2 Ọnwa nka gāburu unu isi ọnwa nile: ọnwa mbu nime ọnwa nile nke arọ ka ọ gāburu unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Ọnwa a ga-abụrụ unu isi ọnwa. Ọ ga-abụ ọnwa mbụ nke ọnwa niile nʼafọ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 12:2
14 Iomraidhean Croise  

N'ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n'arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n'iru Heman, site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n'otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.


Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ala Ijipt, si,


N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi.


Gwanu nzukọ nile nke Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri nke ọnwa nka ka ha gēwere n'onwe-ha, onye ọ bula o were nwa-aturu, dika ulo nna-unu-hà si di, ka otù nwa-aturu diri otù ulo:


Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko.


Ta ka unu onwe-unu nāputa n'ọnwa Ebib.


I gēdebe ememe achicha ekoghi-eko: ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib (n'ihi na ọ bu nime ya ka i siri n'Ijipt puta); ma ọ dighi onye agāhu n'irum ka ọ b͕a aka:


Ememe achicha ekoghi-eko ka i gēdebe. Ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko, dika M'nyere gi iwu, na mb͕e akara àkà n'ọnwa Ebib: n'ihi na ọ bu nime ọnwa Ebib ka i siri n'Ijipt puta.


O rue n'ọnwa mbu n'arọ nke-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.


N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.


N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.


Ọzọ, n'ọwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.


Debe ọnwa Ebib, me-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe ngabiga: n'ihi na ọ bu n'ọnwa Ebib ka Jehova, bú Chineke-gi, mere ka i si n'Ijipt puta n'abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan