Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 12:11 - Bible Nso

11 Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 12:11
21 Iomraidhean Croise  

Eze we nye ndi Juda nile iwu, si, Merenu Jehova, bú Chineke-unu, ememe ngabiga, dika edeworo ya n'akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu nka.


Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n'aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M'huru ọbara ahu, M'gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n'aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M'nētib͕u ndi bi n'ala Ijipt.


Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka.


na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala.


Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:


N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel.


N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.


N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'etiti ehihie na anyasi, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.


Ọzọ, n'ọwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.


Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'arọ nke-abua nke nputa ha si n'ala Ijipt puta, n'ọnwa mbu, si,


Ka eke unu ihe-ọkiké n'úkwù, ka oriọna-unu nēnwu kwa;


Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya:


Ndi muru Ya nēje Jerusalem kwa-arọ n'ememe ngabiga.


we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha.


Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist:


were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu;


Debe ọnwa Ebib, me-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe ngabiga: n'ihi na ọ bu n'ọnwa Ebib ka Jehova, bú Chineke-gi, mere ka i si n'Ijipt puta n'abali.


Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.


N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan